Jeremiah 40

Jeremaya enwere onwe ya

1Mgbe oge nta gasịrị site nʼoge Nebuzaradan ọchịagha ndị nche nọ na Rema mere ka Jeremaya nwere onwe ya, okwu Onyenwe anyị ruru ya ntị. Nebuzaradan hụrụ Jeremaya mgbe e kekọtara ya na ndị e si na Jerusalem na Juda dọta nʼagha agbụ, bụ ndị ahụ a na-ebula Babilọn. 2Mgbe ọchịagha ndị nche eze a hụrụ Jeremaya, ọ sịrị ya, “Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke gị nyere iwu na ihe ọjọọ ndị a ga-abịakwasị ala a. 3Ugbu a kwa Onyenwe anyị emeela ka ihe o kwuru mezuo. O wetarala ala a mbibi ahụ. Ma ihe ndị a niile mezuru nʼihi na ndị gị mehiere megide Onyenwe anyị, jụ irubere ya isi. 4Ma taata, ana m eme ka i nwere onwe gị site nʼagbụ nke e kere gị na nkwoji aka. Ọ bụrụ na ị chọọ, soro m gaa Babilọn. Nʼebe ahụ, aga m elezi gị anya nke ọma. Ọ bụrụkwa na i kpebie na ị gaghị eso m gaa Babilọn, abịala. Ma, lee, ala a niile dị gị nʼihu. Jee ka i biri nʼakụkụ ya ọbụla dị gị mma; jegharịakwa nʼebe ọbụla ị chọrọ.” 5Ma tupu Jeremaya atụgharịa ịhapụ ya pụọ, Nebuzaradan gwakwara ya ọzọ sị, “Laghachikwuru Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, onye eze Babilọn họpụtara ka ọ na-elekọta obodo Juda niile. Gaa soro ya biri nʼetiti ndị gị, maọbụ i nwere ike gaa ebe ọbụla ọzọ dị gị mma.”

Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ nyere ya ihe oriri hiri nne. O nyekwara ya onyinye, hapụ ya ka ọ laa.
6Ya mere, Jeremaya jekwuuru Gedaliya nwa Ahikam na Mizpa, soro ya na ndị fọdụrụ nʼala ahụ biri.

Ogbugbu e gburu Gedaliya nʼike

7Mgbe ndịisi agha ahụ niile na ndị ikom ha, bụ ndị gbalagara nʼọhịa, nụrụ na eze Babilọn emeela Gedaliya nwa Ahikam, onye na-achị ala ahụ, na onye nlekọta ndị ikom na ndị inyom, na ụmụntakịrị, bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ndị a na-eburughị gaa Babilọn, ka ha gaa biri nʼala ọzọ, 8ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ ndị a; Ishmel nwa Netanaya, Johanan na Jonatan ụmụ Kariya, na Seraya nwa Tanhumet, na ụmụ Efai onye Netofa, na Jaazanaya nwa Maaka, na ndị ikom ha. 9Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ṅụọrọ ha iyi, ṅụkwaara ndị ikom ha iyi, sị, “Unu atụla egwu ife ndị Babilọn:
Ya bụ, Kaldịa
birinụ nʼala a, feekwa eze Babilọn, ihe ga-agara unu nke ọma.
10Mụ onwe m ga-ebi na Mizpa ịnọchite anya unu nʼihu ndị Babilọn ga-abịakwute anyị, ma gaanụ chịkọtaa mkpụrụ vaịnị niile, na mkpụrụ niile e kwesiri ịghọkọta nʼoge okpomọkụ, na mmanụ niile. Chikọtanụ ha tinye ha nʼime ite ichebe nri unu. Birikwanụ nʼobodo ahụ niile unu nwetara.”

11Mgbe ndị Juu niile nọ na Moab, na Amọn, na Edọm, na nʼobodo ndị ọzọ niile nụrụ na eze Babilọn hapụrụ ụfọdụ ka ha biri na Juda, na ọ họpụtara Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, mee ya onye na-achị ndị ahụ niile, 12ha niile si nʼebe ahụ ha nọ lọghachikwa nʼala Juda. Ha lọkwutere Gedaliya na Mizpa, site na mba ndị ahụ niile a chụgara ha. Ha chịkọtakwara mmanya vaịnị, na mkpụrụ dị ukwuu, bụ mkpụrụ nke na-acha nʼoge okpomọkụ.

13Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha niile nọ nʼọhịa bịakwutere Gedaliya na Mizpa 14sị ya, “Ọ bụ na i maghị na Baalis eze ndị Amọn ezitela Ishmel nwa Netanaya ka ọ bịa gbuo gị?” Ma Gedaliya nwa Ahikam ekwetaghị na ọ bụ eziokwu ka ha na-ekwu.

15Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya pụrụ na nzuzo jekwuru Gedaliya na Mizpa sị ya, “Biko, kwere ka m gaa gbuo Ishmel nwa Netanaya. O nweghị onye ga-amata otu o si nwụọ. Nʼihi gịnị ka ọ ga-eji gbuo gị, ime ka ndị Juu niile na-alọghachikwute gị gbasasịakwa ọzọ, na imekwa ka ndị Juda fọdụrụ laa nʼiyi?”

16Ma Gedaliya nwa Ahikam zara Johanan nwa Kariya sị ya, “Biko, emela ihe dị otu ahụ! Nʼihi na ihe ị na-ekwu banyere Ishmel abụghị eziokwu.”

Copyright information for IboBIU